Leviticus 14

Usoro ido ụlọ na ndị ekpenta ọcha

1 Onyenwe anyị gwara Mosis, sị, 2“Ndị a bụ usoro iwu gbasara onye ọrịa ekpenta nʼoge a na-eme mmemme ịdị ọcha ya, mgbe e dutere ya bịakwute onye nchụaja. 3Onye nchụaja ga-apụ gaa nʼazụ ebe obibi nọdụ nʼebe ahụ lee ya ahụ, ịchọpụta ma ọrịa ekpenta ya ọ laala nʼezie. Ọ bụrụ na ọrịa ya alaala, 4onye nchụaja ga-enye iwu ka e weta nnụnụ abụọ dị ndụ, na ụfọdụ osisi sida, na eriri ogho uhie, na hisọp, maka onye ahụ a ga-emere mmemme ịdị ọcha. 5Onye nchụaja ga-enye iwu ka e gbuo otu nʼime nnụnụ abụọ ahụ nʼelu mmiri e si nʼọdọ mmiri na-asọ asọ kute nke dị nʼime ite aja. 6Ọ ga-ewere nnụnụ nke ọzọ dị ndụ, ya na osisi sida ahụ, na ogho uhie ahụ, na hisọp ahụ, denye ha nʼime ọbara nnụnụ ahụ e gburu nʼelu mmiri ahụ. 7Mgbe ahụ, onye nchụaja ga-efe ọbara ahụ ugboro asaa nʼahụ onye ahụ a na-eme ka ọ dị ọcha site nʼọrịa ekpenta. Ọ ga-ekwupụtakwa na a gwọọla onye ahụ. Emesịa, ọ ga-ahapụ nnụnụ ahụ ka o felaa nʼọhịa.

8“Onye ahụ e mere ka ọ dị ọcha ga-asacha uwe ya, kpụchaa ntutu isi ya, saakwa ahụ ya. Mgbe ahụ, ọ ga-adị ọcha. Emesịa, ọ ga-esoro ndị mmadụ biri nʼobodo. Ma ọ gaghị abanye nʼụlọ nke aka ya tutu ụbọchị asaa agafee. 9Nʼụbọchị nke asaa, ọ ga-akpụchapụ ntutu isi ya, na afụọnụ ya, na ikuanya ya, na ajị ndị ọzọ dị ya nʼahụ. Ọ ga-asa uwe ya na ahụ ya niile. Mgbe ahụ, a ga-agụ ya nʼonye dị ọcha.

10“Nʼụbọchị nke asatọ, ọ ga-ewere ebule abụọ na-enweghị ntụpọ, na otu nne atụrụ nke na-enweghị ntụpọ gbara otu afọ, ya na iri iko ọka a kwọrọ nke ọma a gwakọtara mmanụ oliv maka aja mkpụrụ ọka, na otu iko mmanụ. 11Onye nchụaja ahụ lere ya ahụ sị na ha dị ọcha, ga-ewere aja ndị a, ha na onye ahụ a na-aga ime ka ọ dị ọcha chee nʼihu Onyenwe anyị nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute.

12“Mgbe ahụ, onye nchụaja ahụ ga-ewere otu nʼime ụmụ ebule ahụ, na otu iko mmanụ chụọ ya dịka onyinye aja ikpe ọmụma. Ọ ga-efufe ha nʼihu Onyenwe anyị dịka aja mfufe. 13Ọ ga-egbu nwa ebule ahụ nʼakụkụ ebe nsọ ahụ, nʼebe a na-anọ egbu anụ aja mmehie na aja nsure ọkụ. Ọ bụ onye nchụaja ga-ewere anụ aja ikpe ọmụma a, dịka o were nke aja mmehie. Ọ bụ ihe dịkarịsịrị nsọ. 14Onye nchụaja ahụ ga-ewere ụfọdụ nʼime ọbara aja ikpe ọmụma ahụ, tee nʼọnụ ntị aka nri nke onye ahụ a na-eme ka ọ dị ọcha. Ọ ga-etekwa ya nʼisi mkpụrụ aka nke aka nri ya, na nʼelu isi mkpụrụ ụkwụ nke ụkwụ aka nri ya. 15Emesịa onye nchụaja ga-awụnyetụ mmanụ oliv ahụ nʼọbụaka nke aka ekpe ya, 16ọ ga-arụnye otu mkpịsịaka nri ya nʼime mmanụ dị nʼọbụaka ya, ọ ga-ewere mkpịsịaka ya fesa ụfọdụ nʼime ya ugboro asaa nʼihu Onyenwe anyị. 17Onye nchụaja ga-ewere mmanụ ahụ fọdụrụ nʼọbụaka ya tee ya onye ahụ nʼọnụ ntị aka nri nke onye ahụ a na-aga ime ka ọ dị ọcha, na nʼisi mkpụrụ aka nke aka nri ya, na nʼisi mkpụrụ ụkwụ nke aka nri ya, nʼelu ọbara aja ikpe ọmụma ahụ mee. 18Ọ ga-ete mmanụ ahụ fọdụrụ nʼaka ya, nʼisi onye ahụ a na-eme ka ọ dị ọcha. Onye nchụaja ga-ekpuchikwara ha mmehie ya nʼihu Onyenwe anyị.

19“Mgbe ahụ, onye nchụaja ga-achụ aja mmehie, kpuchiere onye ahụ a ga-eme ka ọ dị ọcha site na-adịghị ọcha ha mmehie ya. Emesịa, onye nchụaja ga-egbu aja nsure ọkụ ahụ, 20were ya na onyinye mkpụrụ ọka chụọrọ onye ahụ aja, maka ikpuchiri ya mmehie ya. Mgbe ahụ, a ga-agụ onye ahụ nʼonye dị ọcha.

21“Ọ bụrụ na ọ bụ ogbenye onye na-enweghị ike iweta ihe ndị a, ha aghaghị iwere otu nwa ebule dịka aja ikpe ọmụma nke a ga-efufe nʼihi aja ikpuchi mmehie ha, Ọ ga-ewetakwa iko ọka a kwọrọ nke ọma asaa maọbụ ihe ọtụtụ efaa a gwara mmanụ oliv dịka aja mkpụrụ ọka, ya na otu iko mmanụ. 22Ọ ga-ewetakwa nduru abụọ maọbụ kpalakwukwu abụọ, nke ọbụla o nwere ike iweta. Otu ga-abụ maka aja mmehie, nke ọzọ ga-abụ maka aja nsure ọkụ.

23“Ọ ga-ewere ha nye onye nchụaja nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute nʼihu Onyenwe anyị, nʼụbọchị nke asatọ ya, maka ime ka ha dị ọcha. 24Onye nchụaja ga-ewerekwa nwa atụrụ aja ikpe ọmụma ahụ, ya na otu iko mmanụ oliv ahụ, fufee ha nʼihu ebe ịchụ aja nye Onyenwe anyị. 25Ọ ga-egbu nwa atụrụ aja ikpe ọmụma ahụ, were ụfọdụ ọbara ya tee nʼọnụ ntị aka nri onye ahụ a na-aga ime ka ọ dị ọcha, na nʼisi mkpụrụ aka nke aka nri ya, na nʼisi mkpụrụ ụkwụ nke aka nri ya. 26Onye nchụaja ahụ ga-awụnye ụfọdụ mmanụ oliv ahụ nʼọbụaka nke aka ekpe ya, 27ọ ga-ewere mkpịsịaka nri ya fesa ụfọdụ mmanụ ahụ nke dị nʼọbụaka ya ugboro asaa nʼihu Onyenwe anyị. 28Ọ ga-etekwa ụfọdụ mmanụ ahụ dị nʼaka ya nʼebe ndị ahụ o tere ọbara ikpe ọmụma ahụ, nke bụ nʼọnụ ntị onye ahụ nke a na-eme ka ọ dị ọcha, na nʼisi mkpụrụ aka nke aka nri ya, na nʼisi mkpụrụ ụkwụ nke aka nri ya. 29Mmanụ nke fọdụrụ nʼaka ya ka onye nchụaja ga-ete nʼisi onye ahụ a na-eme ka ọ dị ọcha, ikpuchi mmehie ha nʼihu Onyenwe anyị. 30Emesịa, ọ ga-eji nduru abụọ ahụ maọbụ kpalakwukwu abụọ ahụ, nke ọbụla o nwere ike iweta, chụọ aja. 31Otu ga-abụ maka aja mmehie, nke ọzọ ga-abụ maka aja nsure ọkụ, ha na aja mkpụrụ ọka. Nʼụzọ dị otu a, onye nchụaja ga-ekpuchiri ya mmehie ya nʼihu Onyenwe anyị, bụ onye ahụ a na-eme ka ọ dị ọcha.”

32Ndị a bụ usoro iwu dịrị onye ọbụla e sitere nʼọrịa ekpenta mee ka ọ dị ọcha, onye aka ya na-erughị iweta ihe o kwesiri iweta, bụ nke e ji eme ka ọ dị ọcha.

Ọrịa na-efe efe dị nʼụlọ

33 Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn okwu sị, 34“Mgbe unu banyere ala Kenan, bụ ala ahụ m na-enye unu, ọ bụrụ na o nwee ụlọ ọbụla m webatara ọrịa na-efe efe, 35onyenwe ụlọ ahụ ga-ejekwuru onye nchụaja sị ya, ‘Ahụla m ihe yiri ọrịa na-efe efe nʼụlọ m.’ 36Onye nchụaja ahụ ga-enye iwu ka a kwapụsịa ihe niile dị nʼụlọ ahụ tupu ọ gaa lezie ụlọ ahụ anya, ka ihe niile dị nʼụlọ ahụ ghara ịbụ ihe rụrụ arụ, ma ọ bụrụ na achọpụta ọrịa na-efe efe nʼụlọ ahụ. Mgbe a kwapụtasịrị ihe dị nʼụlọ ahụ, onye nchụaja ga-aga lee ụlọ ahụ. 37Ọ ga-ele ntụpọ dị nʼahụ ụlọ ahụ. Ọ bụrụ na ntụpọ ahụ na-acha ahịhịa ndụ ahịhịa ndụ, maọbụ ọbara ọbara,
Nke na-acha mmanụ nri mmanụ nri
ọ bụrụkwa na ha miri emi karịa aja ụlọ ahụ nʼile anya,
38onye nchụaja ga-esi nʼọnụ ụzọ ụlọ ahụ pụọ, kpọchie ụlọ ahụ ụbọchị asaa. 39Nʼụbọchị nke asaa, onye nchụaja ga-alọghachi bịa lee ụlọ ahụ ọzọ. Ọ bụrụ na ntụpọ ahụ agbasaala nʼaja ụlọ ahụ, 40onye nchụaja ga-enye iwu ka e tida akụkụ aja ụlọ ahụ bufuo ya nʼebe a na-ekpofu ihe rụrụ arụ nʼazụ obodo. 41Ọ ga-enyekwa iwu ka a kpụchaa aja ụlọ niile dị nʼime ụlọ ahụ, bufukwaa aja niile a kpụchapụtara nʼebe a na-ekpofu ihe rụrụ arụ nʼazụ obodo. 42A ga-ebute nkume ọzọ jiri ha dochie ndị ahụ e bupụsịrị. A ga-ejikwa ụrọ ọhụrụ tee ụlọ ahụ ọzọ.

43“Ma ọ bụrụ na ntụpọ ahụ apụta ọzọ, mgbe e bupụsịrị nkume ndị ahụ, ma mgbe a kpuchasịrị aja ụlọ ma techikwaa ya, 44onye nchụaja ga-abịa lee ya. Ọ bụrụ na ọ hụ na ntụpọ ahụ agbasaala ọzọ, ọ ga-agụ ụlọ ahụ dịka ihe rụrụ arụ, nʼihi na ntụpọ ahụ bụ ọrịa na-efe efe. 45Ọ ga-enye iwu ka a kwatuo ụlọ ahụ bufukwaa ihe niile e jiri rụọ ya, nkume niile, osisi niile na ụrọ niile, nʼebe a na-ekpofu ihe rụrụ arụ nʼazụ obodo.

46“Onye ọbụla banyere nʼụlọ ahụ nʼoge e mechiri ya, ga-abụ onye rụrụ arụ ruo nʼoge uhuruchi. 47Onye ọbụla dinara ala maọbụ rie nri nʼime ya, ga-asacha uwe ya.

48“Ma ọ bụrụ na onye nchụaja abịa hụ na ntụpọ ahụ apụtaghị ọzọ, mgbe e techara ụlọ ahụ ụrọ nke ugboro abụọ, ọ ga-agụ ya nʼụlọ dị ọcha, nʼihi na ọrịa ahụ na-efe efe alaala. 49Ọ ga-ejikwa nnụnụ abụọ, na osisi sida, na ogho uhie, na osisi hisọp mee mmemme ido ihe ọcha. 50Ọ ga-egbu otu nʼime nnụnụ ndị ahụ nʼelu mmiri e si nʼiyi na-asọ asọ kute, nke dị nʼime ite aja. 51Ọ ga-edenye osisi sida ahụ, na ogho uhie ahụ, na osisi hisọp ahụ, nʼime ọbara nnụnụ ahụ na mmiri ahụ. Ọ ga-efesa ọbara ahụ nʼụlọ ahụ ugboro asaa. 52Ọ bụ ọbara nnụnụ ahụ, na mmiri ahụ, na nnụnụ nke ọzọ ahụ dị ndụ, na osisi sida ahụ na hisọp ahụ, na ogho uhie ahụ ka ọ ga-eji mee ka ụlọ ahụ dị ọcha. 53Ọ ga-ahapụ nnụnụ ahụ dị ndụ ka o fepụ felaa nʼọhịa dị nʼazụ obodo. Nke a ga-abụ otu e si kpuchiere ụlọ ahụ mmehie ya. Ọ ga-adịkwa ọcha.”

54Ndị a bụ usoro iwu metụtara ọrịa ekpenta, na ọkọ, 55na ọrịa na-efe efe dị nʼuwe maọbụ nʼụlọ, 56maọbụ etuto, maọbụ ntụpọ, maọbụ ọnya. 57Iwu ndị a ga-enye aka ịmata ihe rụrụ arụ maọbụ ihe na-adịghị ọcha.

Ndị a bụ usoro iwu metụtara ọrịa ekpenta na ọrịa na-efe efe.

Copyright information for IboBIU